6 nke Epurel | Weekday of Easter

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ (Ọrụ Ndịozi 2:36-41)

N'ụbọchị Pentikost, Pita gwara ndị Juu si : "Ya bụ ka ezinụlọ Izrel niile mazuo na ọ bụ Jesu nke a, onye unu kpogburu n'obe ka Chineke mere ka ọ bụrụ na Onyenweanyị na Kristi anyị." Mgbe ha ṅụrụ nke a, ihe a metụtara ha n'obi. Ha jụrụ Pita na ndị ọzọ,  "Ụmụnna anyị, gịnị ka anyị ga eme?" Pita azaa ha si, " Chegharịanu, sinụ na ihe ọjọọ pụta, onye ọbụla n'ime unu n'otu n'otu ka e mee unu mmiri Chukwu n'aha Jesu Kristi, maka mgbaghara njọ nke unu niile, unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ nsọ. N'ihi na ọ bụ unu, na ụmụ unu, na ndị niile nọ n'ebe dị anya, ka nkwa ahụ dịrịị bụ ndị niile Onyenweanyị Chineke na-akpokotara onwe ya" Pita jikwa ọgologo Okwu Chukwu gwasie ọgbakọ ahụ ike na-adukwa ha ọdụ si,  "Zọpụtanu onwe unu n'agbụrụ Ọjọọ a." N'ihi nke a, ọtụtụ ndị nabatara okwu ya ka e mere mmiri Chukwu. N'ụbọchị ahụ ihe dịka puku mmadụ atọ a gbakwunyere n'ọnụ ọgụgụ ha.

Okwu nke Osebụrụwa.

Abụọma na Azịza (Abụọma 33:4-5. 18-19. 20. 22 (Az. 5b))

Aziza: Uwa jupụtara n'ịhụnanya nke Onyenweanyị.

1. N'ihi na okwu nke Oseburuwa bụ eziokwu, O na akwudosiike n'ọrụ ya niile. Ohụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n'anya, ịhụnanya ya jupụtara n'ụwa.

2. Ma lee ka Onyenweanyị si eleta ndị niile na-atụrụ ya egwu anya, ndị niile tụkwasịrị obi ha n'ịhụnanya ya ka ọ wee zọpụta mkpụrụ obi ha n'ọnwụ ma chekwaba ha oge ọnwụ.

3. Mkpụrụ obi anyị na-eche Onyenweanyị ya bụ onye enyemaka anyị na onye ogbugbo anyị. Ka ịhụnanya gị dị n'ebe anyị nọ, ọ Chineke ebe nchekwube anyị dị na gị.

Mbeku (Abụọma 118:24)

Aleluya.

Taa bụ Ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee aṅụrị, ka obi dị anyị ụtọ na ya.

Aleluya.

Ọziọma (Jọn 20:11-18)

Meri kwụ n'akụkụ ili ahụ, na-ebe akwa, ọ hulatara ala leba anya n'ime ili ahụ. Ọ hụrụ ndị Mmụọọma abụọ yi akwa ọcha, ka ha nọdụrụ ala, otu n'isi, nke ọzọ n'úkwù, n'ebe ahụ a tọgbọrọ ozu Jesu. Ha jụrụ ya si,  "Nwaanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?" Ọ zara ha si,  "Ha ebupula Onyenwe, ma amaghị m ebe ha dobara ya." Mgbe ọ kwuchara nke a, ọ tụgharịrị hụ Jesu ka ọ kwụ. Ma ọ maghị na ọ bụ Jesu. Jesu sịrị ya,  "Nwaanyị, gịnị mere i ji ebe akwa? Ònye ka ị na-achọ?" Nwaanyị ahụ chere na ọ bụ onye ọrụ ubi wee jụọ ya si,  "Nnamukwu, ọ bụrụ gị bụpuru ya, gwa m ebe I dobere ya, ka m ga bụrụ ya." Jesu akpọọ ya si, "Meri" Nwaanyị ahụ a tụgharịa, zaa ya na Hibru si "Raboni! Nke pụtara." Onye nkụzi ". Jesu gwara ya si, E metukwala m aka, n'ihi na arigokwubeghim Nna m. Gakwuru ụmụnna m gwa ha si, Ana m alakwuru Nna m na Nna unu, Chukwu m na Chukwu unu." Meri Magdalin bịara gwa ndị na-eso ụzọ Jesu si, "Ahula m Onyenweanyị." Ọ kororo ha na ọ gwara ya ihe ndi a.

Ọziọma nke Oseburuwa.