25 nke Epurel | Ezigbo Onye Ọzụzụ Atụrụ| Uka nke Ano n’oge Ista

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ (Ọrụ Ndịozi 4:8-12)

Ma Pita, ebe ọ jupụtara na Mmụọ Nsọ, ọ sịrị ha: "Ndị isi ala! Ndị Okenye! Ọ bụrụ na ihe e ji ekpe anyị ikpe taa bụ n'ihi ọrụ ọma a rụrụ n'ahụ onye ngwọrọ, na otu e si mee ka ahụ dị ya mma, ka ọ doo unu niile na ndị Izrel niile anya, na ọ bụ n'aha Jesu Kristi Onye Nazaret, onye unu kpogburu n'obe, onye Chineke mere ka Ọ si n'ọnwụ bilie, ka nwoke a guzo n'ebe a n'ihu unu dị ka onye ahụ zuru oke. Jesu bụ onye ahụ Akwụkwọ Nsọ na ekwu maka Ya si :"Nkume nke unu bụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ, aghọọla nkume dị mkpa n'ụlọ ahụ. Ọ nweghị onye ọzọ pụrụ ịzọpụta anyị. N'ihi na ọ dịghị aha ọzọ dị n'okpuru eluigwe, nke Chineke nyere ụmụ mmadụ a ga-eji azọpụta anyị, karịa aha Jesu.

Okwu nke Osebụrụwa.

Abụọma na Azịza (Abụọma 118: 1 and 8-9. 21-23. 26 and 28-29 (Az. 22))

Aziza: Nkume  ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ, aghọọla nkume dị mkpa n'ụlọ ugbu a. Ma ọ bụ Aleluya.

1. Aleluya, Keleenụ Onyenweanyị n'ihi na ọ dị mma. Maka na ebere Ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ka mma igbaba n'ime Onyenweanyị karịa itukwasa obi na mmadụ. Ọ ka mma igbaba n'ime Onyenweanyị karịa itukwasa obi na ndị ọchịchị.

2.  Aga m ekele GỊ n'ihi na Ị zara m ọkụ. I bụ Onye Nzọpụta m.Nkume  ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ, aghọọla nkume dị mkpa n'ụlọ ugbu a. Ihe a bụ aka ọrụ nke Onyenweanyị, ma ọ bụkwa ihe itunanya n'ebe anyị nọ.

3. Ngọzi dịrị Onye bịara n'aha Onyenweanyị. Anyị Si n'ụlọ Onyenweanyị na-agozi gị. Aga m ekele gị n'ihi na Ị zara m ọkụ. I bụkwa Onye Nzọpụta m. Keleenụ Onyenweanyị n'ihi na ọ dị mma. Obi ọma Ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Ihe Ọgụgụ nke Abụọ (1 Jọn 3:1-2)

Leenụ ụdị ịhụnanya nke Chineke Nna nwere n'ebe anyị nọ! Ọ bụ oké ịhụnanya nke  mere ka a akpọ anyị ụmụ Chineke. Anyị wee bụrụ ụmụ Ya n'eziokwu. Ma otu o di, n'ihi na ụwa amaghị Chineke, ụwa amaghịkwa anyị. Ndị enyi m ọma, ugbu a, anyị aghọọla ụmụ Chineke. E mebeghi ka ihe anyị ga-abụ n'ọdịnihu Pụta ìhè. Ma anyị maara nke ọma na mgbe ọ bụla Chineke ga-eme ka Kristi pụta ìhè, anyị ga-adị ka Ya. N'ihi na anyị ga-ahụ Ya dị ka ọ dị.

Okwu nke Osebụrụwa.

Mbeku (Jọn 10:14)

Aleluya.

Onyenweanyị kwuru si: Abụ M ezigbo onye nche atụrụ. Amaara M atụrụ M, atụrụ M makwaara M

Aleluya.

Oziọma (Jọn 10:11-18)

Jesu kwuru si:  "Mụ onwe M bụ ezi onye ọzụzụ atụrụ. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atogbo ndụ ya n'ihi atụrụ ya. Ma onye ọrụ e goro ego, adịghị elezi atụrụ ya anya. Ọ hụ nkịta ọhịa ka ọ na-abịa, ọ na-agbapu ọsọ, hapụ atụrụ ahụ ka nkịta ọhịa ahụ bụrụ ha, ma ọ bụ chusasia ha. Ọ kpoghi atụrụ ahụ ihe, n'ihi na ọ bụ onye ọrụ e goro ego. Mụ onwe M bụ ezi onye ọzụzụ atụrụ. Amaara M atụrụ m, atụrụ M makwaara M. Dịka Nna M si mara M, Mụ onwe M amarakwa Nna M; otu a ka M si mara atụrụ M. Ana M atogbokwa ndụ M n'ihi atụrụ M. Enwekwara M otutu atụrụ ọzọ, ndị na-anọghị n'ime ogige atụrụ nke a. Aga m akpobatakwa ha ka m nwee nanị otu ogige. Ha ga-anụkwa olu M. Mgbe ahụ nanị otu ìgwè atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ ga-adị. "Nna M hụrụ m n'anya, n'ihi na ana  M atogbo ndụ M ka M wee nara ya ọzọ. Ọ dịghị onye na-anapu M ndụ m. Enwere m ike itogbo ya, nweekwa ike iweghachi ya. Nke a bụ ihe Nna M nyere M iwu ka M mee".

Ozioma nke Oseburuwa.