23rd February, 2021 | St Polycarp, B.M.

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ (Aizaya 55:10-11)

Dịka otu mmiri ozuzo na akummiriigwe na-esi n'eluigwe ezo anaghị alaghachi azụ ruo mgbe ọ gbasara mmiri n'ụwa, bịa mezie ala ka ọ mee ihe akụkụ ka ọ puputa, nye onye ọrụ ugbo ọ riri ọ ga-eri. Otu a ka okwu na-esi m n'ọnụ apụta si adị, ọ nweghị ike ịgba aka lọghachikwute m, kama o ga-emejuputa ihe m bụ n'obi, ma mezuo kwa ihe m jiri maka ya zipụ ya.

Okwu nke Osebụrụwa.

Abụọma na Azịza (Abụọma 34:4-5. 6-7. 16-17. 18-19 (Az. 18b))

Aziza: N'ime ahụhụ ha niile Onyenweanyị na-azọpụta ndị umeala.

1. Soronu m kwupụta ịdị ukwuu nke Onyenweanyị. Soronu m too aha ya. Akpokuru m Onyenweanyị Ọ zaa m, O zọpụtara m n'egwu niile na-atụ m.

2. Ihu ọbụla chere n'ebe Onyenweanyị nọ na-amuke amuke, ihere anaghị eme ya ma ọlị. Onyenweanyị na-aṅụ mkpu ákwá nwogbenye, O na-enyekwara ya aka ná nsogbu ya niile.

3. Onyenweanyị na-elekọta ndị ezi omume anya. O na-egekwa mkpu ákwá ntị. Mana Onyenweanyị na-agbaru ihu n'ebe ndị ajọ omume nọ, Ọ na-eme ka a ghara ichetakwa ha n'uwa.

4. Ndị ezi omume kpọkuru Onyenweanyị, ọ zaa ha, wee zọpụta ha na nsogbu ha niile. Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nsọ, na-enyere dị dara mbà na mmụọ aka.

Mbeku (Matịu 4:4b)

Otito diri Gi O Kristo, Eze nke otito ebebe.

Mkpụrụ obi m na-eche Onyenweanyị, na nkwa ya ka m nwere nchekwube, N'ihi na ịhụnanya Onyenweanyị dị okpu, n'ime ya ka nnukwu nzọpụta dị!!

Otito diri Gi O Kristo, Eze nke otito ebebe.

Oziọma (Matiu 6:7-15)

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya si. "Mgbe unu na ekpe ekpere, unu ekwukwala ọtụtụ okwu na-abaghị uru, dịka ndị mba ọzọ si eme; n'ihi na ha na-eche site n'ọtụtụ okwu, Chineke ga-anu ekpere ha. Unu emekwala ka ha, n'ihi na Nna maara mkpa unu tupu unu arịo ya. Ya bụ, na-ekpenu ekpere otu a: Nna anyị nọ n'eluigwe ka otito dịrị aha Gị ka ọchịchị Gị bịa, ka e mee uche Gị n'ụwa, Dịka e si eme ya n'eluigwe. Nye anyị taata nri nke ụbọchị anyị; Gbaghara anyị mmehie anyị dịka anyị si gbaghara ndị mehiere anyị Ekwela ka anyị kwenye na nranye Ma zọpụta anyị n'ajọ ihe'. N'ihi na ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mmehie ha, Nna unu nke bi n'eluigwe ga-agbagharakwa unu; mana ọ bụrụ na unu agbagharaghi ibe unu mmehie ha mere unu, Nna unu agaghị agbaghara unu mmehie unu.

Ozioma nke Oseburuwa.