22nd February 2021 | Oche Pita di aso (Emume)

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ (1 Pita 5:1-4)

Ana m agba ndị okenye nọ na etiti unu ume; mụ onwe m bụkwa okenye. Abụ m onye akaebe nke ahụhụ niile Kristi tara, bụrụkwa onye ga-eso keta oké otito ahụ a ga-ekpughe. Ana m arịọ unu: Na azunu ìgwè atụrụ nke Chineke tinyere unu n'aka. Na elekotanu ha anya nke ọma dịka Chineke si chọọ. Ọ bụghị na mmanye, kama dịka ndị ọ sịrị n'obi pụta. Na-arunu ọrụ unu, ọ bụghị nanni n'ihi ụgwọ ọ ga akwụ unu, kama n'ihi na ọ na-anu unu ọkụ n'obi ime ya. Unu emegbula ndị nọ na okpuru unu na ndị unu nwe. Kama meenụ onwe unu ihe ajị amaatu nke ìgwè atụrụ ahụ ga-enomi. Mgbe onyeisi ọzụzụ atụrụ ahụ ga-apụta ìhè, unu ga-anatakwa okpueze ahụ nke ebube ya na-adigide.

Okwu nke Osebụrụwa.

Abụọma na Azịza (Abụọma 23:1-3a. 3b-4. 5. 6 (Az. 1))

Aziza: Chineke bụ onye nche m, O nweghị ihe m ga-acho.

1. Chineke bụ onye nche m, O nweghị ihe m ga-acho, O na-eme ka m zuru ike ebe ahihia ndụ dị, O na-eduga m na mmiri, Ebe ahụ ka Ọ na-enye m ike.

2. Ọ na-edu m n'eziomume, n'ihi aha ya, oburugodu na m na-aga na ndagwurugwu nke ọnwụ, egwu ọbụla agaghị atụ m, iji mkpara na ngu gị nodebe m, O bu ha na enye m agbamume.

3. I na akwadoro m nri, n'ihu ndị iro m, I teela isi m mmanụ, iko m ejula n'ọnụ na-agbofu.

4. N'ezie obiọma na ebere ga na-eso m, ụbọchị ndụ m niile. Aga m ebi n'ụlọ nke Chineke ebeebe ebeebe!

Mbeku (Matịu 16:18)

Otito dịrị Gị O Kristi, Eze nke otito ebebe.

Ya bụ, agwa m ghi, ngi bụ Pita, n'elu okwute a ka m ga-arukwasi nzukọ m, onuuzo ọkụ mụọ agaghị emerinata ya.

Otito dịrị Gị O Kristi, Eze nke otito ebebe.

Oziọma (Matiu 16:13-19)

Mgbe Jesu biaruru n'obodo Sizeria Filipi, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya si, "Onye ka ndị mmadụ na-ekwu na nwa nke mmadụ bụ?" Ha sịrị ya, "Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Jọn Onye Na-eme mmirichukwu. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ Elaija. Ma ndị ọzọ na - ekwu na ọ bụ Jeremaya mobu otu onye n'ime ndị amụma." Ma ọ jụrụ ha si, "Onye ka unu na-ekwu na m bụ?" Saịmọn Pita zara si, "I bụ Kristi, nwa nke Chukwu dị ndụ." Jesu wee zaa ya si, "I bụ onye a gọziri agọzi Saịmọn nwa Jona! N'ihi na ọ bụghị mmadụ kpugheere gị eziokwu nke a, kama ọ bụ Nna m nke bi n'eluigwe. Ya bụ, agwa m gị, ngi bụ Pita, n'elu okwute a ka m ga-arukwasi nzukọ m, onuuzo ọkụ mmụọ agaghị emerinata ya. Aga m a chinye gị mkpisiigodu nke Alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ n'elu ụwa, a ga-ekekwa ya n'eluigwe. Ihe ọ bụla Ị ga-atopu n'elu ụwa, a ga-atopukwa ya n'eluigwe.

Ozioma nke Oseburuwa.