20th February 2021 | Saturday after Ash Wednesday

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ (Aizaya 58:9-14)

Oseburuwa na-ekwu: Ọ bụrụ na unu wepụ n'etiti unu mmegbu, ịtụ aka ma ọ bụ ikwu okwu na-agbawa obi: Ọ bụrụkwa na unu enye ndị agụụ na-agụ ihe oriri, mee ka ndị nọ na mkpagbu nweta afọ ojuju, mgbe ahụ ka ihu unu ga-achawaputa n'ọchịchịrị, abalị unu ewee dịka ehihie. Yahweh ga edu unu oge niile. Ọ ga-eji ihe ọma nyejuo unu afọ, ọ ga-emekwa ka ọkpụkpụ unu sie ike, unu ga-ado ka ala ubi a na-agba mmiri, dịka isiiyi nke mmiri ya na-adịghị ata ata. A ga-arụghari obodo unu a kuturu akutu na mbu; unu ga-ewulite ntọala nke ọtụtụ agbụrụ, a ga-akpọ unu "Ndimmezi ihe nke gbajiri agbaji," Ndị odozi ụzọ ebe obibi." Ọ bụrụ na unu akwụsị ịmeto ụbọchị Sabat m. Kwụsị kwa ịchọ ihe ụtọ nke unu n'ụbọchị m dị nsọ, ọ bụrụkwa na unu ewere ụbọchị Sabat kpọrọ ihe, doo ụbọchị nsọ Chineke dịka ụbọchị kwesịrị nsọpụrụ; ọ bụrụ na unu asọpụrụ ya na emeghị uche nke unu, ma ọ bụ ikwu okwu na-abaghị uru mgbe ahụ, unu ga-enwe mmasị n'ebe Yahweh no; aga m eme unu adi elu n'ime uwa; Agam azụ unu site n'ihi nketa nnanna unu bụ Jekọb, n'ihi na ọnụ nke Oseburuwa ekwuola ya.

Okwu nke Osebụrụwa.

Abụọma na Azịza (Abụọma 86:1-2. 3-4. 5-6 (Az. 11ab))

Aziza:  Kụziere m ụzọ gị Onyenweanyị, ka m were okwukwe na eso gị.

1. Gee m ntị Ọnyenweanyi, zaa m, n'ihi na abụ m ogbenye na-enweghị enyemaka. Chekwaba ndum, n'ihi na e nwere m okwukwe na gị, zọpụta nwodibo gi onye tukwasara obi na gi.

2. I bụ Chineke, mere m ebere Ọ Onyenweanyị, O bu gị ka m na-akpọku ụbọchị niile, mee ka mkpụrụ obi nwodibo gị jupụta n'ọnụ, Onyenweanyị, n'ihi na ọ bụ gị ka m na-akpọku n'ekpere m.

3. Onyenweanyị, I dị ebere dị mgbaghara, I nwere nnukwu ịhụnanya n'ebe ndị niile na-akpoku gị nọ. Onyenweanyị, nụrụ ekpere m, Gee m ntị nụrụ arịrịọ m.

Mbeku (Abụọma 95:7d-8a)

Onyenweanyi Jesu, otito na ebube dịrị Gị.

Tufuonụ mmehie ụnụ niile nke unu mere megide m; nwetaranu ọnwe unu obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ.

Onyenweanyi Jesu, otito na ebube dịrị Gị.

Oziọma (Luk 5:27-32)

Mgbe nke a gachara, Jesu pụrụ hụ otú onye ọnaụtụ a na-akpọ Levai ka ọ nọdụrụ n'ụlọ utu; wee si ya, "Sobe m." Ma Levai biliri, hapụ ihe niile sobe ya. Levai kpọrọ oriri ukwuu n'ụlọ ya. Ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị ọzọ sokwa ha nọrọ n'oche nri. Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ ha tamuru ntamu megide ndị na-eso ụzọ Jesu si, "Gịnị mere unu na ndị ọnaụtụ na ndị omenjo ji eriko nri na-anukokwa ihe ọṅụṅụ?" Jesu zara ha si, Mkpa dibịa anaghị akpa onye ahụ sịrị ike, kama ọ na-akpa ọnyá ahụ na - esighị ike. Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume kama ikpo ndị njọ ka ha chegharịa a."

Ozioma nke Oseburuwa.