19th February 2021 | Friday after Ash Wednesday

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ (Aizaya 58:1-9)

Besie akwa ike, ahapụkwala ihe ọbụla, welie olu gị elu dịka opiike gwa ndị nkem m mmehie ha, gwakwa ụlọ nke Jekọb njọ ha. N'agbanyeghị, ha na achọ m kwa ụbọchị na enwe mmasị n'imata ụzọ m, ka a ga-asi na ha bụ mba ndị na-eme ihe ọma, ma ọ bụ ndị na-anaghị agbahapụ iwu nke Chineke ha; ha na-asi m nye ha ikpe nkwụmọtọ, ọ na-amasi ha ibiakete Chineke nso. "Gịnị kpatara anyị jiri buo ọnụ ma ị hụghị ya? Kedu ihe mere anyị jiri butuo onwe anyị ala, ma ị mara ụma dịka ị maghị maka nke a? Ma lee, n'ụbọchị ibu ọnụ, ọ bụ ihe ụtọ nke unu na-achọ, na-emegbu ha ndị niile na-a rụrụ unu ọrụ. Lee, unu na-ebuonu ma na-aga n'ihu n'esemokwu na ilu ọgụ na iji obi ọjọọ na-etigbusi onwe unu. Ụdị ibuonu unu n'ụbọchị taa agaghị eme ka a nụ olu unu n'ebe dị elu. Ọ bụ ụdị ibuonu dị otú a na-amasi m; nke bụ ọnụ unu bụrụ ụbọchị mmadụ na-emeru onwe ya ahụ? Ọ bụ ibudata isi ala dịka ahịhịa pụrụ n'akụkụ mmiri ma ọ bụ I jiri akwa iru uju na iwere ntụ wuo n'ahụ? Unu ga-akpo nke a ibuonu n'ụbọchị nke Oseburuwa họọrọ? Ọ bụ na nke a bụghị ibuonu nke na-amasi m: I tọhapụ agbu nke obi ọjọọ, ibutu ndị mmadụ ibu arụ, were hapụ ndị a na-akpagbu akpagbu ka ha nwere onwe ha wee kujisie inyagba niile? Ọ bụghị ime ka unu na ndị agụụ na-agụ kee nri unu, ikpobata ndị ogbenye na-enweghị ụlọ n'ime ụlọ unu; were kpuchie ọnye gbaoto akwa mgbe unu hụrụ ya ka ọ ghara ịbụ na unu na-ezo onwe unu n'ebe ụmụnne unu nọ. Mgbe ahụ ka ihe unu ga-achawaputa dịka ụtụtụ, otu aka ahụ ka ọgwụgwọ ọrịa unu ga-esi abịa ngwa ngwa. Eziomume unu ga-eburu unu ụzọ. Ebube nke Chineke ga-abu nche azụ unu. Mgbe ahụ ka unu ga-akpo Yahweh ọkụ, o wee zaa unu, mgbe ahụ ka unu ga-ebeku ya ákwá, ọ wee zaa unu; Ebe a ka m nọ. Ọ bụrụ na unu ewepu n'etiti unu mmegbu, ịtụ aka ma ọ bụ ikwu okwu na-agbawa obi.

Okwu nke Osebụrụwa.

Abụọma na Azịza (Abụọma 51:3-4. 5-6ab. 18-19 (Az. 19bc))

Aziza: I naghị ajụ obi gbawara agbawa na nke loghara elogha.

1. Meere m ebere ọ Chineke site n'ịhụnanya gị, Site na nnukwu obi ebere gị hichapụ njọ m niile; Sachapụ mmehie m niile, wuchapu m na njọ m.

2. N'ihi na amarala m mmehie m niile, njọ m nọ na mmụọ m oge niile. O bu so gị, naanị gị ka m mere njo megide, ihe dị njọ na ihu gị ka m mere.

3. I naghị enwe mmasị ọbụla n'àjà, Àjà nsure ọkụ anaghị atọ gị ụtọ, Àjà a na-achụrụ Chineke bụ obi gbawara agbawa, I naghị ajụ obi gbawara agbawa na nke loghara elogha.

Mbeku (Amọs 5:14)

Onyenweanyi Jesu, otito na ebube dịrị Gị.

O bụghị naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n'okwu ọbụla nke si n'ọnụ Chineke pụta.

Onyenweanyi Jesu, otito na ebube dịrị Gị.

Ozịoma (Matiu 9:14-15)

Mgbe Jesu rutere n'akụkụ nke ọzọ, n'obodo Gadara, ụmụ azụ Jọn bịakwutere ya jụọ ya si, "Gịnị mere anyị na ndị Farisii ji ebu ọnụ ma umuazu gị anaghị ebu ọnụ?" Jesu zara ha si, "Ndị bịara oriri agbamakwụkwọ ha ga-ano n'uru mgbe ha na nwoke na-agba akwụkwọ ka nọ? Oge na-abia mgbe a ga-anapụ ha nwoke na-agba akwụkwọ, mgbe ahụ, ha ga-ebube ọnu."

Ozioma nke Oseburuwa.