14 nke Eprel | Izu uka nke abuo n’oge ncheta mbilite n’onwu Kristi

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ (Ọrụ Ndịozi 5:17-26)

Obi onye isi nchụàjà na ndị otu ndị Sadusii jupụtara n'ekworo, ha wee bilie jide ndị ozi tukpuo ha n'ụlọ mkpọrọ nke ọha mmadụ. Mmụọ ozi nke Onyenweanyị bịara n'abalị, meghee ọnụ ụzọ niile nke ụlọ mkpọrọ ahụ, doputa ndịozi ahụ, sị ha, "Gaanụ guzoro n'ụlọnso Chineke Gwanụ ọha mmadụ maka ndụ ọhụrụ nke a." Mgbe ndịozi ahụ nụrụ nke a, ha banyere n'ụlọnso Chineke n'ụtụtụ, malite ikuzi ihe. Onye isi nchụàjà na ndị otu ya bịara kpọọ ọgbakọ ikpe nke ndị Juu na nzukọ ndị okenye Izrel niile. Ha wee ziga ozi n'ụlọ mkpọrọ, nye iwu ka a kpụta ndị ọzi ahụ n'ihu ha. Mgbe ndị ha ziri ozi biaruru, ha ahụghị Ndịozi ahụ n'ụlọ mkpọrọ. Ha wee laghachi kọọrọ ndị nzukọ Sanhedrin ihe ha hụrụ, sị, "Anyị hụrụ ụlọ mkpọrọ ka a kpọchiri ya nke ọma, hụkwa ndị nche ka ha o na nche n' ọnụ ụzọ niile. Ma mgbe anyị meghere ụlọ mkpọrọ, Ọ dịghị onye ọ bụla anyị hụrụ n'ime ha. Mgbe ọchịagha nke ụlọ nsọ Chineke na ndị isi nchụàjà nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharii otu esi achọ ha achọ. Ha na-atụgharị n'uche ha ihe nke a ga-apụta. N'oge ahụ otu nwoke batara si ha,  "Geenụ ntị! Ụmụnwoke ahụ unu tubara n'ụlọ mkpọrọ, kwụ n'ụlọ nsọ Chineke  na-akụziri ndị Juu ihe." Mgbe ahụ ọchịagha nke ụlọ nsọ Chineke na ndị agha nke ụlọ nsọ Chineke na ndị agha ya jere kpọta ndị ozi ahụ n'ihu ụlọ nzukọ. Ma ha apụtaghị ha n'ike, n'ihi na ha na atụ egwu, ka ọha ndị Juu ghara ịtụ ha okwute.

Okwu nke Osebụrụwa.

Abụọma na Azịza (Abụọma 34:2-3. 4-5. 6-7. 8-9 (Az. 7a))

Aziza: Onyenweanyị na-anu mkpu ákwá nwogbenye.

1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile, otito ya ga-adị n'egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla. Mkpụrụ obi m na egori n' Onyenweanyị, ka ndị umeala nụrụ ma ṅụrịa.

2. Soronu m kwupụta ịdị ukwuu nke Onyenweanyị, soronu m too aha ya. Akpokurum Onyenweanyị, Ọ zaa m, O zọpụtara m n'egwu niile na-atụ m.

3. Ihe ọ bụla Chere n'ebe Onyenweanyị nọ na- amuke amuke, Ihere anaghị eme ya ma ọlị. Onyenweanyị na-anu mkpu ákwá nwogbenye, O na-enyekwara ya aka ná nsogbu ya niile.

4. Mmụọọma nke Onyenweanyị na-eche ndị na-atu ya egwu nche: Ọ na-azọpụta ha; Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma! Aṅụrị na-adiri onye gbabara n' Onyenweanyị.

Mbeku (Jọn 3:16)

Aleluya.

Akpodoro ya n'elu obe n'ihi anyị, mana ugbu a Dinwenu esila n'ili bilie.

Aleluya.

Oziọma (Jọn 3:16-21)

Jesu gwara Nikodemus si: N'ihina Chineke hụrụ ụwa n'anya otu a, nke na o nyere so otu nwa ya ka onye ọ bụla kwere na ya ghara ịla n'iyi kama ka o nwee ndụ ebeebe. Chineke zitere nwa ya n'ime ụwa, ọ bụghị ka ọ maa ya ikpe kama ka azọpụta ụwa site n'aka ya. A gaghị ama onye ọ bụla kwenyere na ya ikpe, ma onye na-ekwenyeghi a Malari ya ikpe n'ihina okwenyeghi n'aha so otu nwa Chineke. Nke a bụ ikpe ahụ, na ihe ahụ abiala n'ime ụwa, ma ndị mmadụ hụrụ ọchịchị n'anya karịa ihe, n'ihi omume ọjọọ. Onye ọ bụla na-eme ihe ọjọọ na-akpọ ihe asị. Ọ naghị a bịakwute ihe, ka a ghara ime ajọ omume ya pụta ìhè. Ma onye na-eme ezi omume na-abịakwute ihe ahụ, ka ezi omume ya pụta ìhè, na ọ mere ya n'itu egwu nke Chineke.

Okwu nke Osebụrụwa.