15 nke Eprel | Izu uka nke abuo n’oge ncheta mbilite n’onwu Kristi

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ (Ndịozi  5:27-33)

Ọchịagha nke ụlọ nsọ Chineke na ndị agha ya kpọtara Ndịozi ahụ kwuba ha n'etiti ọgbakọ ikpe nke Sanhedrin. Onye isi nchụàjà jụrụ ha ajụjụ si,  "Ọ kwa anyị dosiri unu aka ná ntị ike ka unu ghara ịkụziri ndị mmadụ ihe n'aha a, mana unu agbasaala ozi unu n'obodo Jeruselem niile na-achọ ibogide anyị ọnwụ nwoke a. Pita na ndị ozi ndị ọzọ zaghachiri si, " Anyị ga-egeriri Chineke ntị karịa mmadụ. Chineke nke nnanna anyị hà mere ka Jesu si n'ọnwụ bilie, bụ onye unu kpogburu n'elu osisi. Chineke buliri ya elu nye ya ọnọdụ n'aka nri ya dịka onye ndú na onye nzọpụta, iji wetara ụmụ Izrel nchegharị na mgbaghara nke njọ. Anyị onwe anyị bụkwa ndị akaebe ihe ndị a, anyị na Mmụọ nsọ nke Chukwu nyere ndị niile na erubere ya isi. Mgbe ha nụrụ nke a, Ọ gbawara ha obi ha wee chọọ igbu ndị ozi ahụ.

Okwu nke Osebụrụwa

Abụọma na Azịza (Abụọma 34:2. 9. 17-18. 19-20 (Az. 7a))

Aziza: Onyenweanyị na-anu mkpu ákwá nwogbenye.

1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile, otito ya ga-adị n'egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla. Detụ ire ka ị hụ ka Onyenwe anyị si dimma! Aṅụrị na-adịrị onye gbabara n' Onyenweanyị. A/

2. Mana Onyenweanyị na-agburu ihu n'ebe ndị ajọ omume nọ, ọ na-eme ka a ghara ichetakwa ha n'ụwa. Ndị ezi omume kpọkuru Onyenweanyị, O za ha, wee zọpụta ha na nsogbu ha niile. A/

3. Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nsọ, na enyere ndị dara mbà na mmụọ aka. O bu eziokwu na nsogbu onye ezi omume karịrị akari, mana Onyenweanyị na-esi na ha niile zọpụta ya. A/

Mbeku (Jọn 20:29)

Aleluya.

Anyị maara na Kristi ebilitela n'ọnwụ, eze nke mmeri bịa nọnyere anyị.

Aleluya.

Oziọma (Jon 13:31-36)

Jesu gwara Nikodemus si: Onye sị n'elu bịa kacha ihe niile elu, ma onye sị n'ụwa pụta bụ mmadụ nke ụwa, okwu ya bụ nanị maka ihe nke Ụwa. Onye sị n'eluigwe bịa kacha ihe niile elu. Ọ na-agba akaebe banyere ihe ọhụrụ na ihe ọ nụrụ ma ọ dịghị onye na-anara ya. Onye nabatara akaebe ya ji nke a mere akara na Chineke bụ eziokwu. Onye ahụ Chineke zitere na-ekwu okwu nke Chineke n'ihi na Chineke na-enyezu Mmụọ enyezu. Chineke hụrụ nwa ya n'anya, ọ ji were ihe niile nye ya n'aka. Onye kwere na nwa ahụ nwere ndụ ebeebe, ma onye na-ekweghị na ya agaghị ahụ ndụ anya, kama ikpe ọmụma nke Chineke ga-adịrị ya.

Ozioma nke Oseburuwa.