13 nke Eprel 2021 | Izu uka nke abuo n’oge ncheta mbilite n’onwu Kristi

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ (Ọrụ Ndịozi 4:32-37)

N'oge ahụ, ọha ndị kwere na Kristi jikọrọ ọnụ n'otu mmụọ na n'otu obi, nweko ihe ọnụ. Ọ dịghị onye ọ bụla n'ime ha na-asị na ihe ọbụla ya nwere  bụ nke nanị ya. Ha ji ike ha niile, na-agba akaebe banyere mbilite n'ọnwụ nke Onyenweanyị Jesu. Amara nke Chineke putakwara ihe n'ahụ ha niile n'ụba, n'ụzọ pụrụ iche. Ọ dịghị onye ọ bụla n'etiti ha a hapụrụ ka ọ nọdụ n'uko. Ndị nwere ala ubi, ma ọ bụ ụlọ rere ha, weta ego niile ha retara, dobe ha n'ụkwụ ndị Umuazu. Ha na-ekesakwa ego ahụ niile, nye onye ọbụla n'otu n'otu, dịka mkpa ya si dị. Otu a ka Josef, bụ onye Levai, onye amuru n'ala Saịrọs, onye ndị ozi kpọrọ Banabas nke pụtara: "Nwanke nkasi obi," si ree ala ubi weta ego ya dobe n' ndị Umuazu.

Okwu nke Osebụrụwa.

Abụọma na Azịza (Abụọma 93:1abc. 1c-2. 5 (Az. 1a))

Aziza: Onyenweanyị bụ eze, ọ yi ebube dịka ụwa.

1.Onyenweanyị bụ eze, ọ yi ebube dịka uwe; kere ike n'ụwa ka ajị. O mere ka ụwa kwuru chi m; nke a na-enweghị ike ịkwa gharakwa ya.

2. Ọ mere ka ụwa kwuru chim; nke a na-enweghị ike ikwaghari ya. Ocheeze gị bido na mgbe ọchie, I dịrịị tupu e kee ụwa.

3. Iwu gị niile kwụsịrị ike, ebe obibi gị dị nsọ Onyenweanyị ruo mgbe ebighị ebi.

Mbeku (Jọn 3:15)

Aleluya.

Jesu Kristi, I bụ onye akaebe dị ntụkwasị obi, onye mbụ si na ndị nwụrụ anwụ pụta, ị hụrụ anyị n'anya, were ọbara gị sachapụ njọ anyị

Aleluya.

Oziọma (Jon 3:7b-15)

Jesu gwara Nikodemus si, Ya atụla gị n'anya, na m si, 'A ga-amughariri gị ọzọ. ' Ifufe na efe ebe ọ bụla ọ soro ya. I na anụ mkpọtụ ya, ma ị maghị ebe ọ si abia na ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dị onye ọ bụla amuru site na Mmụọ Nsọ." Nikodemus jụrụ ya si, " Olee otú nke a ga-esi mee? " Jesu jụrụ ya si " I bụ onye nkụzi Izrel ma ị maghị ihe ndị a? N'ezie agwa m gị, anyị na-ekwu ihe anyị maara, na-agbakwa akaebe ihe anyị hụrụ, ma unu anaghị anara na ịgba akaebe anyị. Ọ bụrụ na ị kwereghi mgbe m gwara gị ihe nke ụwa, olee otú ị ga-esi kwere ma m kọọrọ gị ihe nke eluigwe? Ọ nwebeghi onye ọ bụla rịgooro n'eluigwe mbụ ma ọ bụghị naanị Nwa nke mmadụ onye sị n'eluigwe rịdata. Dịka Mosis si welie agwọ elu n'ime ọzara, otu ahụ ka a ga-esi welie Nwa nke mmadụ elu. Ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee nwee ndụ ebeebe.

Ozioma nke Oseburuwa.