12th April 2021 | Izu uka nke abuo n’oge ncheta mbilite n’onwu Kristi

Ihe Ọgụgụ nke Mbụ (Ọrụ Ndịozi 4:23-31)

Mgbe ndị nzukọ ahụ hapụrụ Pita na Jọn ha gara kọọrọ ndị ụmụnna n'ime Kristi ihe ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu gwara ha. Mgbe ha nụrụ nke a haji otu olu kpeere Chineke, sị, "Onyenweanyị gị onye kere eluigwe na ụwa n'oke osimiri na ihe niile nke dị ha ha n'ime, gị onye sitere n'ike mmụọ nsọ gị mee ka nwodibo gị bụ nna anyị Devid si, "N'ihi gịnị ka mba niile ndị amaghị Chineke ji eme oké mkpa, ndị niile bi n'ụwa ji nọdụ na-atụgharị uche n'ihe efu?" Ndị eze nke ụwa jikeere onwe ha, ndị isi ọchịchị zukọkwara n'otu ebe imegide Onyenweanyị na onye ọ tere ude." N'ime obodo a, ikwu eziokwu, Herọd na Pontus Paịlet zukọrọ, ha na mba ndị ọzọ tere ude. Ha zukọrọ ịmezu ihe niile nke I sitere n'ike gị na uche nsọ gị nke i bụ ụzọ kwuo na ha ga-emezu. Ugbu a Onyenweanyị, lee, hụkwa mba ha na-abara anyị. Nye anyị bụ umuodibo gị ike iji gbasaa ozi gị n'atughi egwu ọbụla. Setịa aka ịgwọ ọrịa niile, ma kwe ka e gosi ọtụtụ ihe ịrịba ama, ka i rụkwaa ọrụ ebube dị iche iche site n'aha Onye Nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ Jesu." Mgbe ha kpechara ekpere, ụlọ ebe ha zukọrọ mara jijiji,. Ha niile wee jupụta na Mmụọ Nsọ na-ekwu okwu Chineke n'atughi egwu ọbụla.

Okwu nke Osebụrụwa.

Abụọma na Azịza (Abụọma 2:1-3. 4-6. 7-9 (Az. 12d))

Aziza: Anuri ga-adịrị ndị tụkwasara obi ha na Dinwenu.

1.  Gịnị ka mba niile ji eme mkpọtụ, Gịnị ka ndị ọgọ mmụọ ji ebu agha? Ndị eze ụwa na-enupụ isi; ndị ụmụ eze na-akpa nkata ọjọọ na-emegide Yahweh na onye nke ya o tere ude. Ha na-ekwu si, "Ugbu a ka anyị kujie mkpara ìgwè ha ji achị anyị ka anyị zọpụta onwe anyị n'aka ọchịchị ha.".

2.  Mana onye ahụ ocheeze ya dị n'eluigwe; no ala achị ọchị; Onyenweanyị na-akwa ha emu, Ma mgbe ahụ Ọ ji iwe gwa ha okwu, egwu ejide ha niile, Ọ kwuru si, "Nke a bụ eze nke m kwubara na Zayọn, ugwu nk m dị nsọ. Aga m ekwupụta iwu nke Onyenweanyị.

3. Onyenweanyị gwara m si, 'I bụ nwa m, taata A bụrụla m Nna gị. Rio m arịrịọ, aga m enye gị mba niile, Ka ha bụrụ ebe ọchịchị gị. I ga-eji mkpara ìgwè kuwaa ha, ma kurichaa ha dịka ite ọnye okpu ite.

Mbeku (Jọn 3:15)

Aleluya.

Kristi bilitere n' ọnwụ, ma mee ihe niile ka ọ dị ọ hụrụ, ọ gosila ebere ya n'ebe mmadụ

Aleluya.

Oziọma (Jọn 3:1-8)

O nwere otu nwoke n'ime ndị Farisii, aha ya bụ Nikodemus, onye ọchịchị nke ndị Juu. Nwoke a bịakwutere Jesu n'otu abalị, sị ya, "Rabai (onye nkụzi) anyị maara na ị bụ onye nkụzi sitere na Chineke. N'ihi na ọ dịghị onye nwere ike iru ihe ịrịba ama ndị a ị na-arụ ma ọ bụrụ na Chineke anonyereghi ya." Jesu zara ya si, "Ana m agwa gị eziokwu, ọ bụ na amugharighi mmadụ ọzọ, ọ gaghị ahụ alaeze Chineke anya." Nikodemus jụrụ ya si, "Olee otú a ga-esi mugharia mmadụ mgbe ọ tozuru dimkpa? Ọ nwere ike ịba nke ugboro abụọ n'afọ nne ya ka e wee mugharia ya ozo?" Jesu zara ya si: "N'igwa gị eziokwu, ọ bụrụ na ejighị mmiri na Mmụọ Nsọ mugharia mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịba na alaeze Chineke. Ihe esi na-anụahụ mụọ bụ anụahụ, ma ihe amuru site na Mmụọ Nsọ bụ mmụọ. Ya atụla gị n'anya, na m si," A ga-amughariri gị ọzọ ifufe na-ebe obula ọ soro ya. I na-anu mkpọtụ ya, ma ị maghị ebe ọ si abịa na ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dị onye ọ bụla a mụrụ site na Mmụọ Nsọ.

Ozioma nke Oseburuwa.